# ase/102007361.xml.gz
# ig/102007361.xml.gz


(src)="1"> A Danger That Concerns Every Parent
(trg)="1"> Nsogbu nke Na - echu Onye Ọ Bụla Bụ́ Nne Ma Ọ Bụ Nna Ụra

(src)="2"> HEATHER and Scott are a vivacious , happy couple , the parents of a bright , healthy three - year - old boy .
(trg)="2"> SCOTT na Heather bụ di na nwunye obi ụtọ , ndị ahụ́ dị gara gara .

(src)="3"> * They take good care of their son .
(trg)="4"> * Ha na - elekọta nwa ha nwoke nke ọma .

(src)="4"> In today’s world , that is no easy job .
(trg)="6"> Ọ na - akpata oké nchegbu .

(src)="5"> It involves a wide array of worries and responsibilities .
(trg)="7"> Ọrụ dị na ya karịkwara akarị .

(src)="6"> There are so many things that children need to be taught !
(trg)="8"> E nwere ọtụtụ ihe e kwesịrị ịkụziri ụmụaka .

(src)="7"> Heather and Scott feel strongly about one responsibility in particular : They want to protect their child from the dangers of sexual abuse .
(trg)="9"> Otu n’ime ibu ọrụ kacha echu Scott na Heather ụra bụ nke a : Ha chọrọ ichebe nwa ha ka a ghara imetọ ya .

(src)="8"> Why ?
(trg)="10"> N’ihi gịnị ?

(src)="9"> “ My father was a cold , angry drunk , ” Heather says .
(trg)="11"> Heather kwuru , sị , “ Papa m bụ onye aṅụrụma ihu na - adịghị atọ ọchị .

(src)="10"> “ He beat me terribly , and he molested me and my sisters . ”
(trg)="14"> O metọkwara mụ na ụmụnne m ndị nwanyị . ”

(src)="11"> * It is widely agreed that such abuse can inflict deep emotional scars .
(trg)="15"> * Ọtụtụ mmadụ kwetara na ụdị mmetọ a na - enye onye e metọrọ nsogbu n’obi nke ukwuu .

(src)="12"> No wonder Heather is determined to protect her son !
(trg)="16"> Ka a sịkwa ihe mere Heather ji kpebisie ike ichebe nwa ya nwoke !

(src)="13"> Scott feels the same about protecting him .
(trg)="17"> Scott chekwara na ọ dị mkpa ka ha chebe nwa ha .

(src)="14"> Many parents are concerned about child abuse .
(trg)="18"> Ọtụtụ ndị nne na nna na - echegbu onwe ha banyere mmetọ a na - emetọ ụmụaka .

(src)="15"> Perhaps you are as well .
(trg)="19"> Ikekwe , ị na - echegbukwa onwe gị banyere ya .

(src)="16"> Unlike Scott and Heather , you may not have come face - to - face with abuse and its effects , but you have no doubt heard shocking reports about the prevalence of this disgusting practice .
(trg)="20"> O nwere ike ịbụ na e metọbeghị gị dị ka e metọrọ Scott na Heather .
(trg)="21"> O nwekwara ike ịbụ na ị maghị otú ọ na - adị .
(trg)="22"> Ma o doro anya na ị nụtụla akụkọ ndị na - awụ akpata oyi n’ahụ́ banyere otú omume ọjọọ a si ju ebe nile .

(src)="17"> Around the world good parents are horrified to learn what is happening to children in their area .
(trg)="23"> N’ụwa nile , obi na - amapụ ezigbo ndị nne na nna ma ha nụ ihe ndị a na - eme ụmụaka bi n’ógbè ha .

(src)="18"> Not surprisingly , one researcher in the field of sexual abuse called the rates of child abuse “ one of the most discouraging discoveries of our era . ”
(trg)="24"> Ọ bụghị ihe ijuanya na otu onye na - eme nnyocha n’ihe banyere imetọ mmadụ kọwara otú imetọ ụmụaka si arị elu dị ka “ otu n’ime ihe a chọpụtarala kasị akụda mmụọ n’oge anyị a . ”
(trg)="25"> Nke a bụ nnọọ akụkọ ọjọọ .

(src)="19"> That is certainly sad news , but are such developments surprising ?
(trg)="26"> Ma ọ̀ bụ ihe ijuanya na ndị mmadụ na - eme omume ọjọọ ndị a ?

(src)="20"> Not to students of the Bible .
(trg)="27"> Ọ naghị eju ndị na - amụ Bible anya .

(src)="21"> God’s Word explains that we are living in a troubled period of time called “ the last days , ” a time marked by a prevalence of “ fierce ” behavior , when people would be “ lovers of themselves ” and would have “ no natural affection . ” ​ — 2 Timothy 3 : 1 - 5 .
(trg)="28"> Okwu Chineke kọwara na anyị bi n’oge nsogbu , nke a na - akpọ ‘ ụbọchị ikpeazụ . ’
(trg)="29"> Ọ bụkwa oge ndị mmadụ ga “ na - eme ihe ike ike , ” oge ha ‘ ga - ahụ nanị onwe ha n’anya , ’ gharakwa inwe “ obi mmadụ . ” — 2 Timoti 3 : 1 - 5 .

(src)="22"> Sexual abuse is a daunting issue .
(trg)="30"> Imetọ mmadụ bụ nsogbu a na - amaghị ihe a ga - eme ya eme .

(src)="23"> Indeed , some parents feel overwhelmed when they contemplate the sheer wickedness of the people who seek out children to abuse them sexually .
(trg)="31"> N’ezie , ọ na - eri ụfọdụ ndị nne na nna ọnụ ma ha cheta otú obi si fee ndị mmadụ azụ , bụ́ ndị na - achọgharị ụmụaka ha ga - emetọ .

(src)="24"> However , is this problem too much for parents to handle ?
(trg)="32"> Ma , nsogbu a ọ̀ karịrị ndị mụrụ ụmụ nke na o nweghị ihe ha ga - emeli banyere ya ?

(src)="25"> Or are there some practical steps that parents can take to keep their children safe ?
(trg)="33"> Ka è nwere ezigbo ihe ndị nne na nna nwere ike ime iji chebe ụmụ ha ka ihe ọ bụla ghara ime ha ?

(src)="26"> The following articles will address these questions .
(trg)="34"> Isiokwu ndị na - esonụ ga - aza ajụjụ ndị a .

(src)="27"> [ Footnotes ]
(trg)="35"> [ Ihe odide ala ala peeji ]

(src)="28"> Names in this series of articles have been changed .
(trg)="36"> A gbanwere aha ndị e kwuru okwu ha n’isiokwu a nakwa n’isiokwu abụọ ndị na - eso ya .

(src)="29"> Sexual abuse of a child occurs when an adult uses a child to gratify his or her own sexual desires .
(trg)="37"> Imetọ nwatakịrị pụtara onye toro eto iji nwatakịrị na - egbo agụụ mmekọahụ na - agụ ya .

(src)="30"> It often involves what the Bible calls fornication , or por·neiʹa , which could include fondling of genitalia , sexual intercourse , and oral or anal sex .
(trg)="38"> Nke a na - agụnyekarị ihe Bible kpọrọ ịkwa iko , ma ọ bụ por·neiʹa .
(trg)="39"> Omume ndị so na nke a bụ ịpị nwoke aka n’amụ ma ọ bụ imetụ nwanyị aka n’ọtụ , idina mmadụ , iji ọnụ amịcha amụ ma ọ bụ ọtụ , na isi n’ikè enwe mmekọahụ .

(src)="31"> Some abusive acts ​ — such as the fondling of breasts , explicitly immoral proposals , showing pornography to a child , voyeurism , and indecent exposure — ​ may amount to what the Bible condemns as “ loose conduct ” or “ uncleanness . . . with greediness . ” ​ — Galatians 5 : 19 - 21 ; Ephesians 4 : 19 .
(trg)="40"> Omume mmetọ ndị ọzọ , ndị dị ka ịpị nwanyị aka n’ara , mmadụ ịgwa onye ọzọ ka ya na ya nwee mmekọahụ n’ezoghị ọnụ , igosi nwatakịrị foto ma ọ bụ fim ndị gba ọtọ , ikiri ndị na - enwe mmekọahụ , na mmadụ ịma ụma gbara ọtọ n’ebe ọ na - ekwesịghị ịgba ọtọ , nwere ike iso n’ihe ndị Bible katọrọ ma kwuo na ha bụ “ omume rụrụ arụ ” ma ọ bụ “ ụdị anyaukwu . . . na - arụpụta adịghị ọcha . ” — Ndị Galeshia 5 : 19 - 21 ; Ndị Efesọs 4 : 19 .

# ase/102007362.xml.gz
# ig/102007362.xml.gz


(src)="1"> How to Protect Your Children
(trg)="1"> Otú Ị Ga - esi Chebe Ụmụ Gị

(src)="2"> FEW of us want to dwell on the subject of sexual abuse of children .
(trg)="2"> Ọ BỤ nanị mmadụ ole na ole n’ime anyị ga - achọ ichewe echiche ogologo oge banyere mmetọ a na - emetọ ụmụaka .

(src)="3"> Parents shudder at the very thought of it !
(trg)="3"> Nanị ichetụdị ya n’echiche na - amapụ ndị nne na nna obi !

(src)="4"> Such abuse , however , is a frightening and unpleasant reality in today’s world , and its effects on children can be devastating .
(trg)="4"> N’agbanyeghị nke a , ụdị mmetọ a nke na - emenye ndị mmadụ ụjọ , nke dịkwa mwute na - eme eme n’ụwa taa .

(src)="5"> Is the matter worth considering ?
(trg)="5"> Ọ na - akpakwa ụmụaka aka ọjọọ .

(src)="6"> Well , what would you be willing to give for the sake of your child’s safety ?
(trg)="7"> Olee ihe ị ga - adị njikere ime ka ihe ọ bụla ghara ime nwa gị ?

(src)="7"> Learning about the unpleasant realities of abuse is surely a small price to pay .
(trg)="8"> Nanị ịmata na e nwere ndị na - emetọ ụmụaka nwere ike iyi ihe ọ na - enweghị ihe ọ bụ .

(src)="8"> Such knowledge can really make a difference .
(trg)="9"> Ma , o nwere ike inye aka ichebe ụmụ gị .

(src)="9"> Do not let the plague of abuse rob you of your courage .
(trg)="10"> Ekwela ka mmetọ a juru ebe nile kụda gị aka .

(src)="10"> At the very least , you have power that your child does not have ​ — strengths that it will take years , even decades , for your child to gain .
(trg)="11"> Ma ọ́ dịghị nnọọ ihe ọzọ , i nwere ike nke nwa gị na - enweghị — ụdị ike nke ga - ewe nwa gị ọtụtụ afọ , ọbụna ọtụtụ iri afọ , tupu ya enweta ya .

(src)="11"> The passing years have brought you a fund of knowledge , experience , and wisdom .
(trg)="12"> Ọtụtụ afọ i birila ndụ emeela ka ị mara ọtụtụ ihe , meekwa ka i nwee ọtụtụ ahụmahụ na amamihe .

(src)="12"> The key is to enhance those strengths and put them to use in protecting your child .
(trg)="13"> Isi ihe dị na ya bụ ịgbakwu mbọ jiri ihe ndị a i nwere na - echebe nwa gị .

(src)="13"> We will discuss three basic steps that every parent can take .
(trg)="14"> Anyị ga - atụle ihe atọ bụ́ isi nne na nna ọ bụla nwere ike ime .

(src)="14"> They are as follows : ( 1 ) Become your child’s first line of defense against abuse , ( 2 ) give your child some needed background education , and ( 3 ) equip your child with some basic protective tools .
(trg)="15"> Ha bụ : ( 1 ) Bụrụ onye mbụ ga - echebe nwa gị ka a ghara imetọ ya , ( 2 ) kọọrọ nwa gị ihe ndị o kwesịrị ịma banyere mmekọahụ , nakwa ( 3 ) kụziere nwa gị ihe ndị bụ́ isi ọ ga - eme iji chebe onwe ya .

(src)="15"> Are You the First Line of Defense ?
(trg)="16"> Ị̀ Bụ Onye Mbụ Na - echebe Nwa Gị Ka A Ghara Imetọ Ya ?

(src)="16"> The primary responsibility for protecting children against abuse belongs to parents , not to children .
(trg)="17"> Ndị ọ bụ ọrụ ha ichebe ụmụaka ka a ghara imetọ ha bụ ndị nne na nna , ọ bụghị ụmụaka .

(src)="17"> So educating parents comes before educating children .
(trg)="18"> Ya mere , ọ dị mkpa ibu ụzọ kụziere ndị nne na nna ihe tupu a kụziwere ụmụaka .

(src)="18"> If you are a parent , there are a few things you need to know about child abuse .
(trg)="19"> Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna , o nwere ihe ole na ole ọ dị mkpa ka ị mata banyere mmetọ a na - emetọ ụmụaka .

(src)="19"> You need to know who abuse children and how they go about it .
(trg)="20"> Ọ dị mkpa ka ị mata ụdị ndị na - emetọ ụmụaka na otú ha si eme ya .

(src)="20"> Parents often think of molesters as strangers who lurk in the shadows , seeking ways to kidnap and rape children .
(trg)="21"> Ndị nne na nna na - echekarị na ndị na - emetọ ụmụaka bụ ndị ha na - amaghị ama , bụ́ ndị na - abịa mgbe ọchịchịrị gbara , na - achọ otú ha ga - esi tọrọ ụmụaka ma dinaa ha n’ike .

(src)="21"> Such monsters certainly do exist .
(trg)="22"> N’eziokwu , e nwere ndị si otú ahụ eme ya .

(src)="22"> The news media bring them to our attention very often .
(trg)="23"> Ụlọ ọrụ mgbasa ozi na - eme ka anyị mara banyere ndị a mgbe nile .

(src)="23"> However , they are relatively rare .
(trg)="24"> Ma , ndị si otú ahụ eme ya dị nnọọ ole na ole .

(src)="24"> In about 90 percent of the cases of sexual abuse of a child , the perpetrator is someone the child already knows and trusts .
(trg)="25"> Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na mgbe ọ bụla e metọrọ nwatakịrị , onye rụrụ arụrụala ahụ bụ onye nwatakịrị ahụ ma ama ma tụkwasị obi .

(src)="25"> Naturally , you do not want to believe that an affable neighbor , teacher , health - care worker , coach , or relative could lust after your child .
(trg)="26"> Ọ na - esi nnọọ ike ikweta na o nwere ike ịbụ onye agbata obi gị nke ihe na - adabara gị na ya , onye nkụzi , nọọsụ ma ọ bụ dọkịta , onye na - akụzi egwuregwu , ma ọ bụ onye ikwu , ga - achọ imetọ nwa gị .

(src)="26"> In truth , most people are not like that .
(trg)="27"> Nke bụ́ eziokwu bụ na ọtụtụ mmadụ adịghị otú ahụ .

(src)="27"> There is no need to become suspicious of everybody around you .
(trg)="28"> Ọ dịghị mkpa ibido nyowe mmadụ nile gị na ha na - emekọ ihe enyowe .

(src)="28"> Still , you can protect your child by learning how the typical abuser operates . ​ — See the box on page 6 .
(trg)="29"> Ma , i nwere ike ichebe nwa gị site n’ịmụta ụzọ aghụghọ onye na - emetọ ụmụaka si abịa . — Lee igbe dị na peeji nke isii .

(src)="29"> Knowing such tactics can make you , the parent , better prepared to act as the first line of defense .
(trg)="30"> Ịmata ụzọ aghụghọ ndị ahụ nwere ike ime ka gị onwe gị bụ́ nne ma ọ bụ nna dịkwuo njikere ịbụ onye mbụ ga - echebe nwa gị .

(src)="30"> For instance , if someone who appears more interested in children than in adults singles out your child for special attention and gifts or offers free babysitting or private excursions with your child , what will you do ?
(trg)="31"> Dị ka ihe atụ , ọ bụrụ na otu onye nke na - enwekarị mmasị n’ebe ụmụaka nọ karịa ka ọ na - enwe n’ebe ndị toro eto nọ enwee mmasị n’ebe nwa gị nọ ma na - emeso ya ihe n’ụzọ pụrụ iche , na - enye ya onyinye ma ọ bụ kwuo ka o legidere gị nwa gị ahụ anya mgbe ị na - agaghị anọ , ma ọ bụkwanụ kwuo ka nanị ya na nwa gị soro kpapụ , gịnị ka ị ga - eme ?

(src)="31"> Decide that the person must be a molester ?
(trg)="32"> Ị̀ ga - ekwubi ozugbo na onye ahụ bụ onye na - emetọ ụmụaka ?

(src)="32"> No .
(trg)="33"> Mbanụ .

(src)="33"> Do not be quick to jump to conclusions .
(trg)="34"> Ekwubila otú ahụ ozugbo .

(src)="34"> Such behavior may be quite innocent .
(trg)="35"> O nwere ike ịbụ na onye mere otú ahụ ebughị ihe ọjọọ ọ bụla n’obi .

(src)="35"> Nonetheless , it can put you on the alert .
(trg)="36"> Ma , nke a nwere ike ime ka i lerukwuo anya ala .

(src)="36"> The Bible says : “ Anyone inexperienced puts faith in every word , but the shrewd one considers his steps . ” ​ — Proverbs 14 : 15 .
(trg)="37"> Bible sịrị : “ Onye na - enweghị uche na - ekwere okwu nile ọ bụla : ma onye nwere ezi uche na - aghọta ijeụkwụ ya . ” — Ilu 14 : 15 .

(src)="37"> Remember , any offer that sounds too good to be true may be just that .
(trg)="38"> Cheta na onye na - ekwe gị nkwa imere gị elu na ala nwere ike ịdị na - ekwe nkwa ahụ iji ghọgbuo gị .

(src)="38"> Carefully screen anyone who volunteers to spend time alone with your child .
(trg)="39"> Jiri nlezianya nyochaa onye ọ bụla gwara gị ka nanị ya na nwa gị nọrọ .

(src)="39"> Let such an individual know that you are likely to check on your child at any time .
(trg)="40"> Mee ka onye ahụ mara na i nwere ike ịbịa leta nwa gị oge ọ bụla ị chọrọ .

(src)="40"> Melissa and Brad , young parents of three boys , are cautious about leaving a child alone with an adult .
(trg)="41"> Melissa na Brad , bụ́ di na nwunye nwere ụmụntakịrị nwoke atọ , na - akpachapụ anya banyere otú ha si ahapụrụ ndị toro eto ụmụ ha .

(src)="41"> When one son had music lessons at home , Melissa told the instructor : “ I’ll be in and out of the room while you’re here . ”
(trg)="42"> Otu oge , mgbe a na - akụziri otu n’ime ụmụ Melissa egwu n’ụlọ ha , ọ gwara onye na - akụziri nwa ya egwu , sị : “ M ga na - abata n’ime ụlọ a mgbe ọ bụla m chọrọ ruo mgbe ị lara . ”

(src)="42"> Such vigilance may sound extreme , but these parents would rather be safe than sorry .
(trg)="43"> O nwere ike iyi ka nke a ọ̀ gafeela ókè , ma ọ kaara ndị nne na nna mma ime otú ahụ karịa ịkwa m̀ makwaara n’ikpeazụ .

(src)="43"> Be actively involved in your child’s activities , friendships , and schoolwork .
(trg)="45"> Mata ndị bụ́ ndị enyi ya , nakwa ihe ọ na - eme n’ụlọ akwụkwọ .

(src)="44"> Learn all the details about any planned excursion .
(trg)="46"> Mata ihe nile banyere mkpapụ nwa gị chọrọ ime .

(src)="45"> One mental - health professional who spent 33 years working with cases of sexual abuse notes that he has seen countless cases that could have been prevented by simple vigilance on the parents ’ part .
(trg)="47"> Otu dọkịta nke na - agwọ ndị isi na - akpakọchaghị ọnụ , bụ́ onye nyeerela ndị e metọrọ aka ruo afọ iri atọ na atọ , kwuru na ya ahụla ọtụtụ mmetọ a gaara egbochi ma a sị nnọọ na ndị mụrụ ụmụ leruru anya ala .

(src)="46"> He quotes one convicted molester as saying : “ Parents literally give us their children . . . .
(trg)="48"> Ọ sịrị na otu onye nke metọrọ ụmụaka , bụ́ onye a mara ikpe , kwuru , sị : “ Ọ bụ ndị nne na nna na - eji aka ha akpọnye anyị ụmụ ha . . . .

(src)="47"> They sure made it easy for me . ”
(trg)="49"> Ha mere nnọọ ka ọ dịrị m mfe . ”

(src)="48"> Remember , most molesters prefer easy targets .
(trg)="50"> Chetakwa na ọtụtụ ndị na - emetọ ụmụaka na - achọ ụmụaka ndị na - agaghị esiri ha ike inweta .

(src)="49"> Parents who are actively involved in their children’s lives make their children difficult targets .
(trg)="51"> Ndị nne na nna , bụ́ ndị na - etinyesi anya ike n’ebe ụmụ ha nọ , na - eme ka o siere ndị na - emetọ ụmụaka ike inweta ha .

(src)="50"> Another way to act as your child’s first line of defense is to be a good listener .
(trg)="52"> Otú ọzọ i nwere ike isi bụrụ onye mbụ ga - echebe nwa gị ka a ghara imetọ ya bụ site n’ige ya ntị nke ọma .

(src)="51"> Children will rarely disclose abuse directly ; they are too ashamed and worried about the reaction .
(trg)="53"> Ụmụaka anaghị ekwukarị hoo haa na e metọọla ha ; ọ na - eme ha ihere , ụjọ na - atụkwa ha n’ihi na ha amaghị ihe ndị mmadụ ga - eme ma ha nụ ya .

(src)="52"> So listen carefully , even for subtle clues .
(trg)="54"> Ya mere , na - ege ha ntị nke ọma iji nụta ụmụ obere ihe ndị ga - eme ka ị mara ihe na - emenụ .

(src)="53"> * If your child says something that concerns you , calmly use questions to draw him out .
(trg)="55"> * Ọ bụrụ na o nwere ihe nwa gị kwuru nke na - enye gị nsogbu n’obi , jiri nwayọọ were ajụjụ jụpụta ya ihe dị ya n’obi .

(src)="54"> * If he says that he does not want a certain babysitter to come back , ask why .
(trg)="56"> Ọ bụrụ na ọ sịrị na ọ chọghịzi ka otu onye nke na - elekọtabu ya na - elekọta ya , jụọ ya ihe mere o ji kwuo otú ahụ .

(src)="55"> If he says that an adult plays funny games with him , ask him : “ What kind of game ?
(trg)="57"> Ọ bụrụ na ọ sị na o nwere otú otu onye toro eto si egwusa ya egwu , jụọ ya , sị : “ Olee ụdị egwu ọ na - egwusa gị ?

(src)="56"> What does he do ? ”
(trg)="58"> Gịnị ka ọ na - eme gị ? ”

(src)="57"> If he complains that someone tickled him , ask him , “ Where did he tickle you ? ”
(trg)="59"> Ọ bụrụ na ọ sịrị na o nwere onye metụrụ ya aka n’ebe na - eme ka ọchị tọwa ya , jụọ ya , sị , “ Olee ebe o metụrụ gị aka ? ”

(src)="58"> Do not be quick to dismiss a child’s answers .
(trg)="60"> Elegharala ihe nwa ahụ gwara gị anya ozugbo .

(src)="59"> Abusers tell a child that no one will believe him ; all too often , that is true .
(trg)="61"> Ndị na - emetọ ụmụaka na - agwa ha na ọ bụrụ na ha kọọrọ ndị mmadụ , na o nweghị onye ga - ekweta ihe ha kwuru ; ihe ahụ ha kwuru na - abụkarịkwa eziokwu .

(src)="60"> And if a child has been abused , being believed and supported by a parent is a big step toward recovery .
(trg)="62"> Ọ bụrụ na e metọrọ nwatakịrị , otu ihe nke ga - eme ka o nwetaghachi onwe ya bụ ma nne ya ma ọ bụ nna ya kweta ihe o kwuru ma nyere ya aka .

(src)="61"> Give Your Child Background Education
(trg)="63"> Kọọrọ Nwa Gị Ihe Ndị O Kwesịrị Ịma Banyere Mmekọahụ

(src)="62"> One reference work on the subject of child abuse quotes a convicted molester as saying : “ Give me a kid who knows nothing about sex , and you’ve given me my next victim . ”
(trg)="64"> Otu akwụkwọ e ji eme nnyocha nke na - ekwu banyere imetọ ụmụaka sịrị na otu onye nke metọrọ ụmụaka , bụ́ onye a mara ikpe , kwuru , sị : “ Ị kpọnye m nwa na - enweghị ihe ọ maara banyere mmekọahụ , mara na ị kpọnyela m onye ọzọ m ga - emetọ . ”

(src)="63"> Those chilling words are a useful reminder to parents .
(trg)="65"> Ndị nne na nna kwesịrị iburu okwu a nke na - awụ akpata oyi n’ahụ́ n’uche mgbe nile .